Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno. Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ. O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu? Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere. Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya. Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a? Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru. O we nara ya, rie n'iru ha. O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.
Gụọ LUK 24
Geere nke a ntị LUK 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 24:36-44
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị