Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete, n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti. Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume. Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha. Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.
Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume, (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke: onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus. O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya. Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso. Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n'azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya. Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite.
N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.