Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya. Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà. Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara. Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka, si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi. Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.
Gụọ LUK 23
Geere nke a ntị LUK 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 23:33-38
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị