Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas: onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu. Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus; ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike. Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ. O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.
Gụọ LUK 23
Geere nke a ntị LUK 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 23:18-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị