Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 23:1-31

LUK 23:1-31 IGBOB

Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n'iru Pailat. Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze. Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru. Pailat we si ndi-isi-nchu-àjà na ìgwè madu nile, Ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie n'aru Nwoke a. Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a. Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili. Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu. Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme. O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike. Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat. Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro. Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju, si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n'iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n'aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n'ihe nile unu ji bo Ya ebubo: é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo. Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe. Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas: onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu. Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus; ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike. Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ. O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ. Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus. Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá. Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu. N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa. Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi. N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?