Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 23:1-16

LUK 23:1-16 IGBOB

Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n'iru Pailat. Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze. Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru. Pailat we si ndi-isi-nchu-àjà na ìgwè madu nile, Ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie n'aru Nwoke a. Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a. Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili. Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu. Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme. O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike. Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat. Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro. Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju, si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n'iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n'aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n'ihe nile unu ji bo Ya ebubo: é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo. Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.