Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.
Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya. Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha. Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya. Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim. Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili. Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá. Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.
Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe.