Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike. Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.
Gụọ LUK 22
Geere nke a ntị LUK 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 22:47-53
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị