Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 22:1-50

LUK 22:1-50 IGBOB

Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju. Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu. O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha. Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego. O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi. Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga. O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie. Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie? Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya. Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu. Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga. Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya. O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu: n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke. O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu: n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia. O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam. Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu. Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table. N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye. Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a. Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku. O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma. Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi. N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi. Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile; Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem, ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka: ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike. O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu. O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim. O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi. O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha. N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu. Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo. O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya. Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa. Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala. Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta, O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya.