Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri; madu nātub͕ọ site n'egwu, site kwa na ile-anya ihe nābiakwasi n'elu-uwa dum madu bi: n'ihi na agēme ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu. Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube. Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso. O we turu ha ilu: Lenu osisi fig, na osisi nile: mb͕e ọ bula ha púru epú ub͕u a, unu huru ya mara kwa n'onwe-unu na mb͕e okpom-ọku di nso ub͕u a. Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na ala-eze Chineke di nso.
Gụọ LUK 21
Geere nke a ntị LUK 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 21:25-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị