Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 15

15
1Ma ndi-ọna-utu na ndi-nmehie nile nābiaru Ya nso inu okwu-Ya. 2Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we nātamu, si Nwoke a nānara ndi-nmehie nke-ọma, nēso kwa ha eri ihe.
3O we tuara ha ilu a, si, 4Òle madu di n'etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n'ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya? 5Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n'ùbú-ya abua, nāṅuri. 6Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu. 7Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.
8Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya? 9Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri. 10Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.
11O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua: 12nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri. 13Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì. 14Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà. 15O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì. 16O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya. 17Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a! 18M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: 19ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu. 20O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku. 21Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ. 22Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya: 23sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ: 24n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ. 25Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú. 26O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia. 27O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n'ihi na ọ nara ya n'aru-ike. 28Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n'ulo: nna-ya we puta, riọ ya. 29Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m'bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m'rapuru ihe i nyere n'iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ: 30ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya. 31O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi. 32Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

LUK 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara