O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha, Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru, onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu. Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri. N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe. Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì: onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume.
Ma mb͕e otù onye nime ndi soro Ya nọdu na nri nuru ihe ndia, ọ si Ya, Ngọzi nādiri onye gēri nri n'ala-eze Chineke. Ma Ọ siri ya, Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu: o we zipu orù-ya n'oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọwori, Bianu; n'ihi na edoziwo ihe nile ab͕u a. Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha. Onye mbu siri ya, Azutaram ubi, ọ dikwam nkpà ipu gāle ya: ariọm gi guam n'onye riọrọ ka arapu ya. Onye ọzọ si-kwa-ra, Azutaram ehi ọlu iri ejikọrọ abua abua, anamaga kwa inwa ha: ariọm gi guam n'onye riorọ ka arapu ya. Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia. Orù ahu we bia, kọrọ onye-nwe-ya ihe ndia. Mb͕e ahu nna-nwe-ulo ahu, ebe iwe were ya, ọ si orù-ya, Pua ọsọsọ ga n'amá nile na uzọ ntà nile nke obodo, kpọbata n'ebe a ndi-ob͕eye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ. Orù ahu we si, Onye-nwe-ayi, emewo ihe i nyere n'iwu, ọnọdu fọdu-kwa-ra. Onye-nwe-ulo ahu we si orù-ya Pua ga n'uzọ nile na ogige nile, rugide kwa madu ka ha bata, ka ulom we juputa. N'ihi na asim unu, na ọ dighi otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire.
Ma oké ìgwè madu nēso ya je: O we chigharia, si ha, Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọghi nna nke ya asì, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umu-nne-ndikom nke ya, na umu-nne-ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. Onye ọ bula nke nēbughi obe nke aka ya, sokwam n'azu, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. N'ihi na ònye nime unu, nke nāchọ íwu ulo-elu, nēbughi uzọ nọdu ala gu ego ọ gēwe, ma o nwere ego ọ gēji lusia ya? Ka ndi nile ndi nāhu ya we ghara imalite ime ya ihe-ọchì ma eleghi anya, mb͕e ọ tọsiri ntọ-ala-ya, ma o nweghi ike iwuzu ya, si, Nwoke a malitere iwu ulo, ma o nweghi ike iwusi ya. Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya? Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n'ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo. Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm. Ya mere, nnú di nma: ma asi na ọbuná nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ di utọ? O kwesighi ala ma-ọbu ebe anēkpofu ǹsí-anu: ha nātupu ya n'èzí. Onye nwere nti inu ihe, ya nuru.