O we nēzí ihe n'otù nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike. Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli. Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi. O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto. Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike. Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri? Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike? Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n'ihi ihe-ebube nile Ọ nēme.
Gụọ LUK 13
Geere nke a ntị LUK 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 13:10-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị