Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 11:37-54

LUK 11:37-54 IGBOB

Ma mb͕e Ọ nēkwu okwu, onye-Farisi kpọrọ Ya ka O so ya rie nri-ututu: O we ba, nọdu na nri. Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu. Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ub͕u a ka unu onwe-unu, bú ndi-Farisi, nēme ka azú iko na afere di ọcha; ma ime-unu juputara n'ipunara-madu-ihe na ajọ ihe. Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya? Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n'ebe unu nọ. Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu. Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nāhu isi oche nile n'ulo-nzukọ nile, na ekele n'ọma-ahia nile, n'anya. Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n'elu ha nāmataghi ya. Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n'ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere. O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu. Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha. Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n'ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha. N'ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M'gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa; ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n'aka ọb͕ọ a; site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a. Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n'ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata. Mb͕e O siri n'ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe; nēche Yá anwu, inwude ihe nke gēsi n'ọnu-Ya puta.