Ọ nāchupu kwa mọ ọjọ nke dara ob͕i. O we rue, mb͕e mọ ọjọ ahu putasiri, na onye-ob͕i ahu kwuru okwu; O we ju ìgwè madu nile anya. Ma ufọdu nime ha siri, N'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ. Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya. Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda. Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n'ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru. Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n'udo: ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya. Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa. Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta. Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya. Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu.
O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri. Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.
Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n'ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. N'ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a. Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n'ebe a. Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.
Ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nādọba ya n'ebe di nzuzo, ma-ọbu n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nābà nime ulo we hu ìhè-ya. Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n'ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n'ọchichiri. Ya mere, le anya ma ihè di nime gi abughi ọchichiri. Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n'ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n'ìhè, dika mb͕e oriọna, site n'ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè.