Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku, Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ. O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha. O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala. O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu. O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà) N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
Gụọ LUK 1
Geere nke a ntị LUK 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 1:46-55
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị