Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 8:14-24

LEVITIKỌS 8:14-24 IGBOB

Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie. O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie. Ọ were abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà. Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu. Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu. O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu. Ọ bọ ebulu ahu n'ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu. Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu. O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya. Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu.