Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 26:23-33

LEVITIKỌS 26:23-33 IGBOB

Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem; Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu. M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro. Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu. Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem; M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu. Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa. M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi. M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu. Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya. Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.