Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 25:24-55

LEVITIKỌS 25:24-55 IGBOB

N'ala nile nke ihe-onwunwe-unu unu gēnye kwa ihe-nb͕aputa bayere ala ahu. Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo. Onye ọ bula, mb͕e ọ nēnweghi onye-nb͕aputa, ma aka-ya eruwo, ọ we huta ihe gēzu nb͕aputa-ya; ya gu kwa arọ nile nke orire-ya, nyeghachi nwoke ọ renyere ya ihe fọduru; ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya. Ma mb͕e aka-ya achọtaghi ihe gēzu inweghachi ya n'onwe-ya, ihe ọ reworo gādi kwa n'aka onye zuworo ya rue arọ jubile: ma na jubile ahu ọ gāpu, ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya. Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēre ulo-obibi n'obodo nwere mb͕idi buruburu, nb͕aputa-ya gādi kwa rue mb͕e arọ orire-ya gēruzù; otù nb͕a-arọ ka nb͕aputa-ya gādi. Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya rue mb͕e ọ nwezuru arọ zuru okè, ulo ahu nke di nime obodo nwere mb͕idi buruburu gēguzosi-kwa-ra onye nāzú ya ike rue mb͕e ọ gādiru, rue ọb͕ọ-ya nile: ọ gaghi-apu na jubile. Ma ulo nile nke obodo ntà nēnweghi mb͕idi buruburu, tiyere ọhia nke ala ahu ka agāgu ha, nb͕aputa diri ha, na jubile ka ha gāpu kwa. Ma obodo nile nke ndi Livai, ulo nile nke obodo nile nke ihe-onwunwe-ha, ike nb͕aputa ebighi-ebi ka ndi Livai gēnwe. Ma asi na ọnye ọ bula nime ndi Livai ab͕aputa ihe, ulo nke ereworo, na obodo nke ihe-onwunwe-ya, gāpu kwa na jubile: n'ihi na ulo nile nke obodo nile nke ndi Livai bu ihe-onwunwe-ha n'etiti umu Israel. Ma agaghi-ere ọhia nke ebe-ita-nri nke obodo-ha; n'ihi na ihe-onwunwe ebighi-ebi ka ọ buru ha. Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi. Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi. Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, inye unu ala Kenean, iburu unu Chineke. Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n'ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù: dika onye egoro ọlu, dika onye-nnọdu, ka ọ gānọ n'aka-gi; rue arọ jubile ka ọ gēfè òfùfè n'aka-gi: o gēsi kwa n'aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa. N'ihi na ndi-orùm ka ha bu, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: agaghi-ere ha dika anēre orù. Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi. Ma orù-gi ndikom na orù-gi ndinyom, ndi i gēnwe; site n'aka mba nile nke di unu buruburu, site n'aka-ha ka unu gāb͕ata orù-ndikom na orù-ndinyom. Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe. Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù. Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa: mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya: ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya. Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya. Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n'ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya. Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n'arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya. Dika onye egoro ọlu kwa-arọ ka ọ gānọ n'aka-ya, ọ gaghi-ewere nkpab͕u zọda ya n'anya-gi. Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n'arọ ndia, ọ gābu kwa n'arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya. N'ihi na Mu ka umu Israel buru ndi-orù; ndi-orùm ka ha bu ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.