Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie: ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha. Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha. Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu. Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel. Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu: Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere: nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara. Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu: ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha. Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà. Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū. Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, agēbupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku. Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: n'ihi na n'ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n'iru Jehova. Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ buru unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: ọ bu ukpuru ebighi-ebi. Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n'ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu: o gēkpuchi kwa nmehie nke ebe nsọ a di nsọ, nmehie ulo-ikwū nzute na nke ebe-ichu-aja ka ọ gēkpuchi kwa: ọ gēkpuchi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, kpuchi-kwa-ra ndi nile nke nkpọkọta a, nmehie-ha. Nka gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi, ikpuchiri umu Israel nmehie nile ha otù ub͕ò n'arọ. Ọ we me dika Jehova nyere Moses iwu.