Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 15

15
1Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n'anu-aru-ya, n'ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu. 3Nka gābu kwa ọrurú n'orùrù-ya: ma ọ bu na anu-aru-ya nērù n'orùrù-ya, ma ọ bu na eb͕ochiwo anu-aru-ya n'orùrù-ya, orurú-ya ka ọ bu. 4Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú. 5Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 6Onye nānọkwasi n'ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 7Onye nēmetu anu-aru nke onye ahu nwere orùrù gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 8Ọzọ, mb͕e onye nwere orùrù gābusa onye di ọcha ọnu-miri: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 9Ihe ọ bula eji anọkwasi anumanu nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāru kwa árú. 10Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula di n'okpuru ya aru gāru árú rue anyasi: onye nēbu kwa ha gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 11Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 12Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri. 13Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha. 14Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà: 15onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.
16Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n'aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 17Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 18Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.
19Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi. 20Ihe ọ bula nke o nēdinakwasi n'idi-na-nsọ-ya gāru kwa árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú. 21Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 22Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula ọ nānọkwasi aru gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 23Ọ buru kwa na ọ bu n'ihe-ndina ka ọ dikwasi, ma-ọbu n'ihe nke ya onwe-ya nānọkwasi, mb͕e ọ nēmetu ya aru, ọ gāru árú rue anyasi. 24Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.
25Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu. 26Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya. 27Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 28Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha. 29N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 30Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù nke ọrurú-ya.
31Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.
32Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n'aru-ya pua, imeru ya nime ya; 33na nke nwayi nke aru nādighi ya ike n'idi-na-nsọ-ya, na nke onye nwere orùrù, bú orùrù nke nwoke ma-ọbu nke nwayi, na nke nwoke nke ya na nwayi ruru árú nēdina.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

LEVITIKỌS 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye