Jehova we gwa Moses okwu, si, Nka gābu iwu onye-ekpenta n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na emewo ka ihe-otiti ekpenta si n'aru onye-ekpenta ahu la; onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n'elu miri nērù erù: nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n'ọbara nnunu ahu eb͕uru n'elu miri nērù erù: ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru. Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa. O gēru kwa n'ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha. Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu. Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu: onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova: o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu: onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka nri ya: onye-nchu-àjà gēweta kwa ufọdu nime log nke manu ahu, wusi ya n'ọbu-aka-ekpe nke onye-nchu-àjà ahu: onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova: ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma: ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova. Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku: onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.
Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu; na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku. Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n'ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n'iru Jehova. Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova: o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya: ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n'ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu: onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova: onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu: ma nke fọduru nime manu nke di n'ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n'elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova. Ọ gāchu kwa otù nime nduru ahu n'àjà, ma-ọbu nime umu-kpalakwukwu ahu, nime ihe aka-ya ruru; ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n'iru Jehova. Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha.