Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?
Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?
Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?
Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.
Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.
Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.
I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.
I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.
Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.
Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.
Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.
Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.
Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,
Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.
Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.
Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.
Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.
Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.
Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.
Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.
I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.
Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.
Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.
I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.
I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;
Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.
Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara.
I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.
I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.
I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.