Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ-ÁKWÁ 3:1-26

ABÙ-ÁKWÁ 3:1-26 IGBOB

Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ. Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche. Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú. O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.