Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula: Joshua we si ha, Gabiganu n'iru ib͕e Jehova, bú Chineke-unu, rue etiti Jọdan, buliere onwe-unu, nwoke ọ bula otù nkume, tukwasi n'elu ubu-ya, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di: ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ? unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi. Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu. Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.
Gụọ JOSHUA 4
Geere nke a ntị JOSHUA 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOSHUA 4:4-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị