Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 4:1-11

JOSHUA 4:1-11 IGBOB

O rue, mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan, na Jehova gwara Joshua okwu, si, Werenu n'onwe-unu ndikom iri na abua sitere na ndim, otù nwoke otù nwoke n'ebo ọ bula, nye-kwa-nu ha iwu, si, Bupuru onwe-unu n'ebe a, n'etiti Jọdan, n'ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà, nkume iri na abua, bubiga ha n'etiti unu, dọba ha n'ọnọdu-abali ahu, ebe unu gānọ abali ta. Joshua we kpọ ndikom iri na abua ahu, ndi o doziworo site n'umu Israel, otù nwoke otù nwoke site n'ebo ọ bula: Joshua we si ha, Gabiganu n'iru ib͕e Jehova, bú Chineke-unu, rue etiti Jọdan, buliere onwe-unu, nwoke ọ bula otù nkume, tukwasi n'elu ubu-ya, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di: ka nka we buru ihe-iriba-ama n'etiti unu, mb͕e umu-unu gāju ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi nkume ndia n'ebe unu nọ? unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi. Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu. Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta. Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga. O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.