Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem. Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova. Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu. Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-sera, nke di n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash. Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel. Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n'Ijipt bugota, nime Shekem, n'òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n'aka umu Hemoa nna Shekem n'ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa. Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.
Gụọ JOSHUA 24
Geere nke a ntị JOSHUA 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOSHUA 24:25-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị