Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida. Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida: o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka: o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida. Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan: ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben: ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel: ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim): ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna: ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri. Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.
Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron). Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha. Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa. Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.