Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 15

15
1Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida. 2Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida: 3o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka: 4o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida. 5Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan: 6ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben: 7ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel: 8ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu: 9ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim): 10ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna: 11ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri. 12Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.
13Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron). 14Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha. 15Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa. 16Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye. 17Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye. 18O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ? 19Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.
20Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.
21Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua; 22na Kina, na Dimona, na Adada; 23na Kedesh, na Hezoa, na Itnan; 24na Zif, na Telem, na Bealot; 25na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa); 26na Amam, na Shema, na Molada; 27na Haza-gada, na Heshmon, na Bet-pelet; 28na Haza-shual, na Bia-sheba, na Biziotia; 29na Beala, na Iyim, na Ezem; 30na Eltolad, na Kesil, na Họma; 31na Ziklag, na Madmana, na Sansana; 32na Lebaot, na Shilhim, na Ain, na Rimon: obodo nile di orú na iteghete, ha na obodo ntà ha.
33N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna; 34na Zanoa, na En-ganim, na Tapua, na Inam; 35na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba; 36na Shaaraim, na Aditaim, na Gedira, na Gedirotaim; obodo iri na anọ na obodo ntà ha.
37Zenan, na Hadasha, na Migdal-gad; 38na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel; 39na Lekish, na Bọzkat, na Eglon; 40na Kabon, na Lahmam, na Kitlish; 41na Gedirot, na Bet-degon, na Neama, na Makeda; obodo iri na isi na obodo ntà ha.
42Libna, na Eta, na Ashan; 43na Ifta, na Ashna, na Nezib; 44na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha.
45Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile: 46site n'Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n'akuku Ashdod, na obodo ntà ha.
47Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.
48N'ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko; 49na Dana, na Kiriat-sana (nke ahu bu Debia); 50na Anab, na Eshtemo, na Anim; 51na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha.
52Arab, na Duma, na Eshan; 53na Janim, na Bet-tapua, na Afika; 54na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha.
55Maon, na Kamel, na Zif, na Juta; 56na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa; 57na Kain, na Gibea, na Timna; obodo iri na obodo ntà ha.
58Halhul, na Bet-zua, na Gedoa; 59na Maarat, na Bet-anot, na Eltekon; obodo isi na obdo ntà ha.
60Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha.
61N'ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka; 62na Nibshan, na Obodo Nnú, na En-gedi; obodo isi na obodo ntà ha.
63Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOSHUA 15: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara