Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 13:1-15

JOSHUA 13:1-15 IGBOB

Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta. Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile; site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa, site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait: na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat: ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu. Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n'ihe-nketa. Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha; site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon; na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon; na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka; ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha. Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta. Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu. Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.