Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu: Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon; na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga: na ókè-ala Og, bú eze Beshan, onye sitere na ndi fọduru nke Refaim, onye bi n'Ashtarot na n'Edrei, nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon. Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.