Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 11

11
1O rue, mb͕e Jebin, bú eze Hezoa, nuru ya, na o zigara Jobab, bú eze Madon, ziga-kwa-ra eze Shimron, ziga-kwa-ra eze Akshaf, 2ziga-kwa-ra ndi-eze ndi nọ n'Ugwu, bú n'ugwu, na n'Araba nke di na Ndida Kinerot, na n'ebe di ala ala, na n'ebe nile di elu nke Doa n'Ọdida-anyanwu, ozi; 3o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa. 4Ha we puta, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile tiyere ha, bú ndi bara uba, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba, ha na inyinya na ub͕ọ-ala bara uba nke-uku. 5Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha. 6Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku. 7Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n'akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha. 8Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha. 9Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n'ọku.
10Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n'ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile. 11Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n'ọku. 12Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu. 13Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n'obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku. 14Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu. 15Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n'ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu.
16Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya; 17site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua. 18Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha. 19Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n'udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n'agha. 20N'ihi na o sitere n'aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n'agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.
21Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha. 22Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru. 23Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOSHUA 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara