Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 10:1-15

JOSHUA 10:1-15 IGBOB

O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha; o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike. Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si, Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo. Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha. Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi. Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà. Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi. Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo. Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda. O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue. Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel, Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon; Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon. Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu. Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha. Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara