Job we za, si, N'ezie amawom na ọ di otú a: Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri. O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo? Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya. Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji. Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà. Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu. Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida. Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi. Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya. Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?
Gụọ JOB 9
Geere nke a ntị JOB 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 9:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo