Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 40:1-8

JOB 40:1-8 IGBOB

Jehova we za Job, si, Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya. Job we za Jehova, si, Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum. Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ. Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara. Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?