Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 38:19-38

JOB 38:19-38 IGBOB

Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè? Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya; Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya, Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya? I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi, Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne! Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe, Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà, Nye ubọchi ọ̀gù na agha? Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè, Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa? Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri, Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe; Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi; Bú ọzara madu nēbighi nime ya; Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu; Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu? Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna? Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi? N'àfọ onye ka ice nēsi puta? Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya? N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha, Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru. Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades, Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion? Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya? Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe? Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa? Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji, Ka njubiga miri we kpuchie gi? Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je, Si kwa gi, Le ayi? Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime? Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta? Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe? Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha, Mb͕e ájá nāghọ urọ, Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha?