Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 3

3
1Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya. 2Job we za, si:
3Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì,
Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.
4Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri;
Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya,
Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.
5Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya;
Ka igwe-oji biri n'elu ya;
Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.
6Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya:
Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ;
Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.
7Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà;
Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.
8Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu,
Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.
9Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri:
Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa;
Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:
10N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta,
O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.
11N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua?
N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?
12Gini mere ikperè abua di n'irum inaram?
Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?
13N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū
M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
14Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,
Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;
15Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,
Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:
16Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;
Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?
17N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;
Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.
18N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;
Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.
19Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;
Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.
20N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?
N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?
21Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;
Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;
22Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,
Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.
23N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,
Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?
24N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia,
Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.
25N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim,
Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.
26Anọghm n'udo, anọghkwam jū, ezughkwam ike;
Ma ime-nkpatu biara.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JOB 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye