Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 28:12-28

JOB 28:12-28 IGBOB

Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya; Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu. Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di: Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam. Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya, Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya. Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia, Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya. Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya: Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya. Agaghi-ehota coral na crystal: E, nnweta amam-ihe kariri ruby. Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya, Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya. Ma amam-ihe, òle ebe o si bia? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu, Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya. Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri, Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya. Chineke aghọtawo uzọ-ya, Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya. N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa, N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe; Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù. Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo, Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe: Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya; O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya. O we si madu, Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.