Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a! Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo! Ma asi na eji pen ígwè na òpù Ka ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi! Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu, Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu: Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke: Onye mu onwem gāhuru onwem, Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo n'imem. Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya? Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem; Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.
Gụọ JOB 19
Geere nke a ntị JOB 19
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JOB 19:23-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo