Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu. Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa. Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya. Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia. Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile.
Gụọ JỌN 8
Geere nke a ntị JỌN 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 8:25-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị