Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka. Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya? Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a. Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu? Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya? Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu. Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha), Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme? Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie. Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya
Gụọ JỌN 7
Geere nke a ntị JỌN 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 7:40-53
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị