Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe. Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ? Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem. Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem. Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya. Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um? Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi? Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya. Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù. Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike? Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.
Ya mere ufọdu nime ndi Jerusalem siri, Onye a, Ọ̀ bughi Onye ha nāchọ uzọ ib͕u? Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi? Otú ọ di ayi matara Onye a ebe O si puta: ma mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, ọ dighi onye ọ bula mara ebe O si puta. Ya mere Jisus tiri nkpu n'ulo uku Chineke, nēzí ihe, nāsi kwa, Unu mataram, mata kwa ebe M'si puta; ọ bughi kwa n'Onwem ka M'biaworo, kama Onye ziterem bu ezi Onye, Nke unu onwe-unu nāmataghi. Mu onwem matara Ya; n'ihi na esim n'ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram. Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n'ihi na oge hour Ya akābiaghi. Ma n'etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere? Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya. Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem. Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia. Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe? Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia?
Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri. Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa. Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto. Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka.