Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a? Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu. Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà. Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile? Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere. Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu? Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie. Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe. N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu. Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile. Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi. Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli. N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ. Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.
Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n'ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n'elu-igwe ridata. Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata? Jisus zara, si ha, Unu atamula n'etiti onwe-unu. Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem. Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n'ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi. Mu onwem bu nri nke nēnye ndu. Nna-unu-hà riri manna ahu n'ọhia, ha we nwua. Nka bu nri nke si n'elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu. Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.
Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie? Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu. Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie. Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya. Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim. Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Ihe ndia ka O kwuru n'ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum.