Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 5:31-47

JỌN 5:31-47 IGBOB

Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie. Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie. Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà. Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu. Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge. Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom. Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya. Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà; unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu. Anaraghi m otuto n'aka madu. Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu. Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara. Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi? Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n'iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya. N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ. Ma ọ buru na unu ekweghi ihe onye ahu dere n'akwukwọ, ùnu gēsi aṅa kwere okwu nkem?