N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu. N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu. N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya: O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu. Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya, ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé. Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.
Gụọ JỌN 5
Geere nke a ntị JỌN 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 5:24-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị