Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 5:16-30

JỌN 5:16-30 IGBOB

N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike. Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu. Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra. Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu. N'ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n'anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya. N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu. N'ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya; ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya. N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu. N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu. N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya: O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu. Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya, ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé. Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Meberè Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara