Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu. Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi. Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ: ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.
Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n'etiti ha mb͕e Jisus biara. Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli.
Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n'etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n'etiti ha, si, Udo diri unu. Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n'ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere. Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem. Jisus si ya, N'ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere.