Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe.
Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta: ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha. Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU. Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik. Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju. Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya.
Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n'obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n'elu we gazu n'aru uwe-ime ahu dum. Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si,
Ha kère uwem nye onwe-ha,
N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà.
Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia. Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso.