Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru. Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a? Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka? Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.
Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m. Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige? Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa.
Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga. Ya mere Pailat pukuru ha n'èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a? Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n'aka-gi. Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n'iwu ib͕u onye ọ bula: ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu.
Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n'onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem? Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere? Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta. Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum. Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu?
Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju? Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.