Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu. Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi, bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu. M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu. Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu. N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu. Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya. Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa? Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ. Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem. Okwu ndia ka M'gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide.
Gụọ JỌN 14
Geere nke a ntị JỌN 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 14:15-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị